Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Soludo Amalitela Achumnta Vootu

Chinwe Onuigbo dere ya na Bekee

0 396

Gọvanọ Chukwuma Soludo amalitela achumnta vootu maka ndị ji ọkọrọtọ otu ndọrọndọrọ All Progressive Grand Alliance, APGA azọ ọchịchị na mpaghara Kansụl Idemili South na Anaocha nke steeti Anambra na nkwadebe ntuliaka izugbe nke onwa Febrụwarị na Maachị.

N’oge mmemme ahụ, Gọvanọ malitekwara ileba anya n’ọrụ nrụzigharị n’okporo ụzọ Afor Nnobi-Awka Etiti-Ichida-Nkwo-Igboukwu, tinyere ịmalite ọrụ okporo ụzọ Nnokwa-Adazi Enu-Akwaeze dị kilomita isii na ụma anọ.

Gọvanọ ahụ rịọrọ nkwado ndị Anambra maka ndị na-azọ ọkwa n’otu ndọrọndọrọ All Progressive Grand Alliance, na-ekwe nkwa na ha ga-aga n’ihu na-ewetara ndị mmadụ uru ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ndị isi oche Kọmitii nchere oge na mpaghara Idemili South na Anaocha kansul, Oriakụ Amaka Obi na Mazị Ikechukwu Ozor gụpụtara ọtụtụ ọrụ na atụmatụ mmepe Gọvanọ na mpaghara niile nke akụ na ụba steeti ahụ, ma gosi na vootu maka APGA bụ vootu maka agamnihu.

Ndị na-azọ ọkwa n’aha APGA na mpaghara ndị a gara gụnyere Ikenna Iyiegbu, Maazị Ejike Ikechukwu, Oriakụ Njideka Oraedum, na ndị ọzọ, kwere nkwa na ha na Gọvanọ ga-arụkọ ọrụ iji kwalite steeti ahụ ma a họpụta ha.

Ndị otu kansụl ọchịchị steeti ahụ gụnyere Onye isi ndị ọrụ, Maazị Ernest Ezeajughi, Kọmishọna na-ahụ maka ntụrụndụ na omenala, Kọmishọna na-ahụ maka ahụike, Dọkịnta Afam Obidike na Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ Maazị Ifeanyi Okoma, n’etiti ọtụtụ ndị nwere mmasị na paati ahụ bịara mmemme ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *