Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ndị ọzọ Kwankwaso kwuru n’ọgbako na Chatham house

0 137

Onye na-azọ ọkwa Onyeisiala n’afo 2023 n’aha otu ‘New Nigerian People’s Party(NNPP) bụ Rabiu Kwankwaso ekwuola na ihe dị iche na pati ya na ‘Labour Party’ (LP) bụ na pati ya bụ nke Naijiria ebe nke labour bụ maka otu agbụrụ.

Kwankwaso kwuru nke a n’ọgbakọ ya na ndị gụwaraisi nwere na Chatham House dị na mba Briten n’ụbọchị Wenezde.

N’ọsịsa nke otu onye so na ndị bịara gwara ya ka ọ rituoro onye na-azọ ọkwa onyeisiala n’aha Labour Party, Kwannkwaso kwuru sị, ” E nwee pati nke kwudoro n’agbụrụ nakwa ụka onye na-ekpe ya bụ ihe dị iche n’etiti Labour Party na pati anyị nke bụ o-zuru-Naijiria-ọnụ.”

“Dịka anyị na-ebo ndị ndu ebubo ime otu ihe maọbụ nke ọzọ na adịghị mma, e chere m na ndị na-eso ha kwesịrị ịmụta etu e si abụ ndị Naijiria ,karịa ịbụ ndị si n’otu mpaghara.”

O kwuru na onye jụrụ ya ajụjụ kaara ịjụ ya ihe mere na o ritughị ka ya na APC maọbụ PDP rụkọọ ọrụ kama ịjụ ya naanị maka Labour Party

“A chọrọ m ị gwa gị na pati anyị , NNPP, bụ naanị pati toorola na Naijiria taa. Anyị ahụla ebe pati ọbụla ọkachasị nke ị kpọrọ aha ya nwere ike itoru.”

“N’ebe anyị nọ, ọ dịka Andrews Liver Salt. Ọ nọkatara tipụta, ugbua , o na-agbada. Nke a bụ nke bụ eziokwu i kwesịrị ịmata.

“N’aka nke ọzọ, NNPP, bụ pati anyị bụ naanị pati na-enweta nkwado.”

Leave A Reply

Your email address will not be published.