Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Amapụtala Ego Dị N1.9 Trillion Maka NNPC Ịrụgharị Okporo Ụzọ

Cyril Okonkwo dere ya na Bekee

0 394

Ndị isi ụlọ ọrụ gọọmentị etiti enyela ụlọ ọrụ Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC), Ltd ikike ịrụgharị okporo ụzọ gọọmenti etiti dị iri anọ na anọ nke ogologo ha dị kilomita 4,554 na ọnụ ego dị N1.9 trillion.

Nke a sotere ntụzịaka Ministri na-ahụ maka ọrụ na ụlọ nye Council n’okpuru Federal Government Road Infrastructure Development and Refurbishment Investment Tax Credit Policy Phase 2 nke Nigeria National Petroleum Corporation (NNPC) Limited na ndị enyemaka ya.

Nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Onyeisiala (Office of the Vice President), Laolu Akande kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu banyere ihe si na nzukọ ndị isi nke Wenezde nke Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo nọrọ n’isi ya.

Akande, onye gwara ndị nta akụkọ okwu n’aha Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola kwuru na Kansụl ahụ kwadokwara akwụkwọ ozi ọzọ nke Mịnịsta tinyere maka nkwekọrịta ịrụ okporo ụzọ dị itoolu.

O kwuru na nke a sochiri inye akwụkwọ ikike nnabata nke ụlọ ọrụ Infrastructure Concession Regulatory Commission maka afọ iri abụọ na ise maka okporo ụzọ ọ bụla.

“Okporo ụzọ ndị ga-adị n’okpuru ogo nke mbụ a bụ okporo ụzọ Benin-Asaba Corridor; Abuja-Lokoja-Onitsha-Owerri-Aba; Shagamu-Benin; Abuja-Keffi-Akwanga-Makurdi; Kano-Maiduguri; Enugu-Port Harcourt; Lagos-Ota-Abeokuta na Lagos-Badagry-Seme,” Akande kwuru.

O kwuru na Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na ụlọ nwetakwara ikike nke Kansụl maka mkpọnye aka na nkwekọrịta maka ịrụzigharị okporo ụzọ Oshogbo-Ilesha Phase 1 na steeti Osun n’ọnụego otu ijeri naira na ụma abụọ wee si otu a gbanwee ego nkwekọrịta ahụ site na ijeri naira atọ gaa ijeri naịra anọ nke nọchiri anya mmụba pasentị iri atọ na atọ nke ego mbụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *