Take a fresh look at your lifestyle.

Kpachapụnụ anya maka ọgwụ ụkwara ndị a – Nafdac

0 550

Ụlọọrụ ‘National Agency for Food and Drugs Administration and Control’ adọọla ọha obodo aka na ntị ka ha kpachara anya maka ọgwụ ụkwara abụọ a kpọrọ AMBRONOL na DOK-1 Max maka na ha nwere akụrụngwa na-adịghị mma maka ahụike n’ime ha.

N’ozi ha wepụtara n’ọba ozi ha n’ụbọchị Sọnde, Nafdac kwuru na ọ bụ na mba Uzbekistan ka a chọpụtara akụrụngwa ọjọọ n’ime ọgwụ ụkwara abụọ ahụ.

Nafdac kwuru na ọgwụ ụkwara abụọ ahụ dara nnyocha nke pụtara na ekwesịghị ka mmadụ ṅụọ ha.

“Nnyocha sayensị gosiri na ọgwụ abụọ ahụ nwere akụrụngwa ‘diethylene glycol na ethylene glycol’ nke ọnụọgụgụ ya gafere ole o kwesịrị ịdị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *