Ọka okwu ụlọ omebeiwu Naijiria bụ Hon. Femi Gbajabiamila akpọkuola ndị otu ya na ndị Naijiria ka ha dịrị n’otu maka ịga nke ọma nke ntuliaka na-abịa n’ihu.
Ọ kpọrọ oku a mgbe ọ na-anabata ndị otu ya ka ha laghachitelu n’ụlọ ndị omebe iwu ka emechara ezumike ekeresimesi na afọ ọhụrụ,
”Ndị omebe iwu ibe m, ka nhoputa ndi ọchịchị na-abịaru nso, enweela mmụba pụtara ihe n’ihe gbasara enweghị nchekwa na mwakpo ọjọọ megide ndị ndọrọndọrọ ọchịchị n’akụkụ ụfọdụ nke mba anyị. Anyị aghaghị ịdị n’otu iji hụ na ihe ndi a dị ize ndụ agaghị eweta ọnọdụ ndị na-eyi ntuli aka na-abịanụ egwu.
O kwuru na “nchekwa na ọdịmma nke ndị mmadụ ga-abụ isi ebumnuche gọọmentị”. Iwu manyere anyị niile bụ ndị ṅụrụ iyi ije ozi na gọọmentị ime ihe niile iji chebe ndụ na akụ na ụba ụmụ amaala niile ma kwalite ọdịmma ha karịa ihe niile. Ọrụ a bụ isi na nkwekọrịta dị n’etiti gọọmentị na ụmụ amaala. Dịka ndị ọchịchị n’ime obodo na mpaghara anyị dị iche iche, anyị ga-emerịrị ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ziri ezi. Anyị ga-ahụkwa na okwu anyị na omume anyị bụ nke agaghị ebute enweghị nchekwa ma ọlị. Nke a bụ ọrụ iwu kwadoro nke anyị agaghị esi na ya pụọ”.
Ọka okwu ahụ nyekwara ndị ọrụ nchekwa ekele kasị ukwuu ndị nọ n’oge a guzo n’akụkụ dị iche iche nke mba ahụ, na-agabiga ihe ize ndụ ma na-achụ aja kasịnụ iji chekwaa udo.
Ọ gbakwụnyere na ọ na-atụ anya ka afọ gaa nke ọma nke ga-enwe nnukwu ihe nrụpụta na ijikọta ọnụ n’ọrụ mwulite obodo
Ike Umenaba
Leave a Reply