Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe mere APC na PDP ji agbarịta onwe ha egbe ọnụ

0 476

Esemokwu dị n’etiti ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala n’aha pati Peoples Democratic Party na ogbo ya nke All Progressive Congresss abanyela n’ogogo ọzọ dịka ndị PDP sara oku APC kpọrọ nke sị ka a nwụchie ma kpee onye nke ha ikpe maka mpụ na nrụrụaka.

Onyeisi achụmnta vootu APC bụ Festus Keyamo kpọrọ oku nọọrọ n’ụbọchị kpọọ oku sị ka e were ụbọchị abụọ nwuchieonye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala make mpụ.

N’akwụkwọ ozi ahụ, Keyamo gwara ụlọọrụ na-ebu aha megide mpụ bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), na ndị ogbo ya ndị ọzọ ka ha nwuchie ma nyocha Atiku Abubakar nke PDP.

Na nzaghachị PDP sị na oku a APC na-akpọ bụ ka ha megharịa ndị mmadụ anya site na nsogbu ndị na-akpagbu Naịjirịa ugbua.

N’ozi ahụ nke odeakwụkwọ mgbasaozi PDP bụ Debo Ologunagba wepụtara, ha sị na Bola Ahmed Tinubu nke APC nwere ọtụtụ mpụ na nrụrụaka dị iche iche dị n’isi ya.

Ozi ahụ sị n’ihi nke a na Tinubu etozughi oke iso na ntuliaka ọkwa onyeisiala ga-adị n’afọ a.

N’otu aka ahụ APC na-ekwukwa na Atiku kwesiri ịnọ na nga ugbua na-abụghị ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *