Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị APC Enugu nwere agba abịaghị achụmta vootu Tinubu

0 329

Ọtụtụ ndị ọnụ n’eru n’okwu na pati APC Enugwu abịaghị achụm nta votu maka onye isi ala Naijiria nke Sinatọ Bola Ahmed Tinubu mere ụnyịahụ bụ wed 11th January 2022.                                                                                                                                                                                                                                     Isi okwu bụ na nsogbu dị ukwuu ebutela nkewa na APC Enugwu, nke na ọtụtụ n’ime ha ekwenyeghị na nhọpụta emere wepụta Ọka ikpe Ugo Agballa dịka onye isi pati ahụ n’Enugwu nakwa ọtụtụ nsogbu ndị ọzọ.

Ndị a iwe dị n’obi kewapụrụ onwe ha gụnyere, Minister n’ahụ maka Mba ọzọ bụ Geoffrey Onyeama, onye bubu Senate President, Ken Nnamani, Aka chiburu Enugwu bụ Ọka Ikpe Sullivan Chime, onye ndụmọdụ President Buhari na ihe gbasara Ikpe bụ Juliet Ibekaku, onye jibu ọkwa onye is pati APC n’Enugwu bụ Ben Nwoye, Emperor Baywood Ibe n’ọtụtụ ndị ọzọ.

Nsogbu APC n’Enugwu dịzị ka ihe dị ime ma kwọrọ nwa n’azụ n’ihi na ọbụghị nani na ndị nwere agba akwadoghị nhọpụta Ugo Agballa dịka onye isi Patị n’Enugwu, ha bokwara ya ebubo na orela ụlọ ejiri mara APC na GRA Enugwu ma kwaga ndị ọrụ ebe ọzọ.                                                                    Ebubo ọzọkwa na ebute nnukwu nsogbu na pati Ahụ bụ ka ha siri kee ego karịrị out ijeri dollar bụ ego ha nwetara n’aka pati.

Okpara Square ejughị eju

Ndị gbakọrọ n’Ọkpara Square, Enugwu maka achụmta vootu Bola Tinu ehighị nne

Ndị otu pati APC pụtara ịnabata ma kwado Seneto Tinubu mana ha ejughị eju ka a tụrụ anya n’ihi na ha ofu obi anọghịzị. N’okwu ya, Gọvanọ Hope Uzodimma yọrọ Tinubu mgbaghara na ndị mmadụ apụtaghị etu ha kwesiri. Uzodimma kwuru na site taa gaba na ya ga atinyesi aka ike ịhụ na ndị mpaghara ọwụwa anyanwụ n’enye nkwado ha.

Ndị ozo kwugasịrị okwu na ya bụ mme mme were yọ ndị igbo ka ha tinyere Tinubu votu gunyere Gọvanọ Ebonyi Dave Umahi, APC governorshi candidate Ebonyi, Ognonna Nwifuru, onye na azọ gọvanọ Enugwu Uche Nnaji, Sinato Andy Uba, Adams Oshiomale, Abike Dabirj na ọtụtụ ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *