Take a fresh look at your lifestyle.

Peace Anyiam-Osigwe, onye Nollywood a ma ama alaala mmụọ

0 304

Peace Ogechi Anyiam-Osigwe, nwa ada mmepụta ejije Nollywood mara ama, alaala mmụọ.

Nwa ada Anyiam-Osigwe bụ onye hibere emume nturuugo ‘Africa Movie Academy Awards’ (AMAA) nakwa ụlọọrụ Africa Film Academy, bụ nke na-ewu na mpaghara Afrịka niile.

Ozi si n’aka ndị ezinụlọ ya kwuru na “Peace bụ Ada n’ezinụlọ Anyiam-Osigwe, ma bụrụkwa mmadụ pụrụ iche, onye nwere obi ọma, ezigbo onye ndu nakwa onye ma etu o si achụ ihe dị ya mkpa ma nweta ya”.

“Anyị bụ ndị ezinụlọ ya ga na-agba mbọ ịhụ na ọrụ ya niile ga na-aga n’ihu.”

Ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ na ndụ

 

  • Aha nne na nna ya bụ Emmanuel Onyechere na Dorathy Osigwe Anyiam-Osigwe
  • Ọ bụ onye Nkwere dị n’Imo Steeti mana nne ya si n’ezinụlọ Edozie dị n’Egbu, Owerri
  • Ọ bụ ya bụ naanị nwaanyị nne na nna ya mụrụ
  • Ọ bụ ya bụ nwa nke ikpeazụ
  • O nwetara ọzụzụ dịka ọkaiwu n’ihi na nne ya chọrọ ka ọ bụrụ onye ọkaiwu mana ihe na-amasị ya bụ ịgụ na ide akwụkwọ, nakwa imepụta ihe nkiri
  • Dịka ọ gụchara akwụkwọ ọkaiwu, ọ hapụrụ ya banye ọrụ ime ejije
  • O mepụtara ejije mbụ ya oge ọ dị afọ 16

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.