Take a fresh look at your lifestyle.

Nigerian Immigration Service achụọla mmadụ anọ ma butuo ọkwa ndị ọzọ maka nrụrụaka

0 422

Ụlọ ọrụ Nigeria Immigration Service (NIS) ebutuola ọkwa ndị otu ha mmadụ iri na anọ ma rie mmadụ iri abụọ na abụọ ngha maka nrụrụaka.

Ọnụ na-ekwuchitere ulo oru a bụ Tony Akuneme kwuru nke a site n’akwụkwọ ozi ha wepụtara n’ụbọchị Tuzde ebe ọ nọrọ kwuo sị, ” A chụọla mmadụ anọ, butuo ọkwa mmadụ iri na anọ dịka ha bịara zara ọnụ ha“.

Akuneme kwuru na nke a bụ iji hụ na ya bụ ngalaba na-arụ ọrụ ha etu ọ kwesịrị.

O kwuru na dịka ewepụrụ mmadụ anọ n’ọrụ ha, na ezịgara mmadụ abụọ ọzọ ebe ọzọ.

Na mgbakwunye ka o kwuru sị, ” Mmadụ iri na otu bụ ndị enyere akwụkwọ ịdọ aka na ntị ebe otu onye bụ onye enyere ezụmike nke n’erughị eru”.

Leave A Reply

Your email address will not be published.