Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii anwụchiela ndị na-atụ mgbere nwa na Port Harcourt

0 432

Ndị uweojii n’Steeti Rivers anwuchiela mmadụ anọ ndị ha sị ji ụmụaka a mụrụ ọhụrụ atụ mgbere.

Dịka ndị uweojii si kwuo, ọ bụ mmadụ gbaara ha ama gbasara ụlọ abụọ dị n’Igwuruta nakwa Omagwa, n’okpuruọchịchị Ikwere, Rivers Steeti, ebe ndị ọjọọ a ji mere isi ụlọọrụ ha.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị dị ime ka ndị uweojii zọpụtara ebe ahụ, ụfọdụ ka ku nwa a mụrụ ọhụrụ n’aka. Ụfọdụ n’ime ha ka bụ ụmụaka dị ebe afọ iri ise.

Otu n’ime ụmụnwaanyị ahụ dị ime sị na ndị nwe ebe ahụ kwere ya nkwa ego N800,000 ma ọ bụrụ na ọ mụọ nwa nwoke, na N700,000 maka nwa nwaanyị.

Grace Iringe-Koko bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Rivers Steeti kwuru na ha akpụrụla mmadụ anọ bụ ndị nwe ụlọ ịtụ mgbere ahụ gawa n’isi ụlọọrụ ha, ma malitekwa nnyocha miri emi.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *