Take a fresh look at your lifestyle.

Senegal etinyela iru uju abalị atọ n’ihi ihe mberede

0 221

Onyeisiala mba Senegal etinyela iru uju abalị atọ n’ihi ihe mberede nke tara isi mmadu iri ano,ma meruo otutu mmadu ahu.

Ihe ruru mmadụ iri ano allala mmụọ dịka ụgbọala bụs abụọ takọtara isi na mba Senegal.

Nnyocha ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ gosiri na ọ bụ ụkwụ taya otu n’ime ụgbọala ahụ gbara nke mere ka ụgbọala ahụ tụgharịa ma kụọ ụgbọala nke na-abịa n’ihu ya.

Ihe ruru mmadụ iri asato na asaa merụkwara ahụ n’ụzọ dị icheiche n’ihe mberede a bụ nke ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ihe mberede kacha njọ n’ime ọtụtụ afọ.

Onyeisiala Macky Sall etinyela abalị atọ iji ruo uju maka ndị nwụrụ n’ihe mberede a ma kwe nkwa na gọọmentị ga-etinye atụmatụ dị icheiche maka nchekwa ndị njem

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.