Take a fresh look at your lifestyle.

Mmadụ iri ato na otu ka ndị ekperima tọọrọ n’ọdọ ụgbo oloko Edo Steeti – Gọọmentị

0 340

Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị ojiegbe a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ma tọrọ ọtụtụ mmadụ n’ọdọ ụgbọ oloko dị n’Igueben, Edo Steeti.

Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Edo Steeti bụ Chidi Nwabuzor si kwuo, “ọ bụ ndị na-eche ịbanye ụgbọ oloko si Benin aga Warri na Delta Steeti ka ndị ọchịehi a wakporo.

Nwabuzor kwuru na ya bụ ihe mere n’ebe elekere anọ nke ehihie ụbọchị Satọde,abali asaa nke obnwa Disemba.

“Ndị ọchịehi bucha AK47 wakporo ọdọ ụgbọ oloko ma bido ịgbali egbe elu. Ha tọọrọ ụfọdụ n’ime ndị njem banye n’ime ọhịa,” ka Nwabuzor kwuru n’akwụkwọ ozi ahụ nke ntaakuko hụrụ.

“Ndị uweojii abanyela n’ime ọhịa ahụ ugbua iji chọta ndị ahụ a tọọro.”

Mgbe ndi ntaakuko kpọrọ Chidi Nwabuzor n’ekwentị n’ụtụtụ Sọnde, o kwuru na ọ bụ ya zipuru ozi ahụ iji mee ka ndị mmadụ mata ihe merenụ, ka obi ha dajụọ maka na ọtụtụ akụkọ ụgha na-efesa.

“Mana anyị ka na-eme nnyocha, anyị ga-ezipụta ozi nke zuru oke n’oge adịghị anya,” ka o kwuru.

Nwabuzor kwuru na amabeghị ọnụọgụgụ ndị mmadụ a tọọrọ na mwakpo a, “mana onyeisi ndị uweojii na mpaghara Irrua, onyeisi ụlọọrụ ndị uweojii dị n’Igueben, ndị otu nche ‘Edo State Security Network, ndị nche ime obodo, nakwa ndị dinta agaala n’ebe ya bụ ihe mere kpọmkwem iji mee ka nchekwa laghachi n’ebe ahụ”.

Ihe ga-eme ka ụdị mwakpo mere n’ọdọ ụgbọ oloko n’Edo Steeti kwụsị – Atiku

Onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa bụ Atiku Abubakar akatọọla mwakpo ndị ọchịehi wakporo ọdọ ụgbọ oloko dị n’Edo Steeti, ma kwuo na Naịjirịa kwesịrị ihibe ndị uweojii na steeti dị icheiche ngwangwa.

Atiku kwuru nke a n’ụbọchị Sọnde site n’akara Twitter ya dịka akụkọ pụtara na ndị ọchịehi tọọrọ ọtụtụ ndị mmadụ ma merụkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ n’ọdọ ụgbọ oloko dị n’Igueben, Edo Steeti.

“Mwakpo a egosila ihe o ji dị mkpa ka anyị mee ọsịsọ hazigharịa atụmatụ nchekwa obodo anyị iji chekwaa ndụ na akụnụba ndị mmadụ,” Atiku kwuru.

“Otu ụzọ anyị nwereike isi mee nke a bụ imegharị iwu anyị iji nye ohere ka steeti dị icheiche nwee ndị uweoji nke ha.

“Ọ jọgburu onwe ya na ndị oyi ndụ egwu ka enwe atụmatụ ịwakpo ndị mmadụ, kpaa ya bụ nkata ma hazichaa ihe niile ha ga-ahazi iji hụ na mezuru atụmatụ ha, na-enweghị otu ọbụla ndị ọrụ nchekwa ga-esi gbochie ha.”

Atiku kwuru na ọ dị mkpa ka Naịjiria nweta akụrụngwa Tekịnụzụ ọgbara ọhụrụ iji gbochie ụdị mwakpo ọjọọ a.

“Anyị kwesịkwara ịgba mbọ wetuo ọnụọgụgụ ụmụaka na-anaghị aga akwụkwọ bụ ndị na-awagharị n’ime obodo anyị, iji gbochie ha isonyere ndị otu oyiegwu.”

“Ekwenyere m na ọ bụrụ na anyị tinye ihe ndị a niile n’ọrụ, ọnọdụ nchekwa obodo anyị ga-aka mma, mekwaa ka ọnọdụ akụnụba anyị gbalite.”

Ihe mere mbụ emeela ọzọ

Ime ụgbọ oloko Abuja-Kaduna dịka ndị ojiegbe wakpochara ya na Maachị 2022

Mwakpo nke a na-abịa n’ihe erubeghị otu afọ ụdị mwakpo a mere n’Abuja, n’ọnwa Maachị afọ 2022.

Ndị ekperima ‘bandits’ wakporo ụgbọ oloko bu ndị njem si Abuja na-aga Kaduna, gbuo ọtụtụ ndị njem, nke gụnyere nwa agbọghọ bụ dọkịta aha ya bụ Chinelo Megafu, ma tọrọkwa ọtụtụ n’ime ha.

Ha ji ogbunigwe gbarie okporo ụgbọ oloko ahụ nke mere ka ya bụ ụgbọ oloko daa, ha wee malite ịkwa ya mgbọ.

Tupu ndị agha abịaruo ebe ahụ, ndị ekperima ahụ emchaala ihe ha chọrọ ime ma chịkọrọ ndị mmadụ gbakpuo n’ime ọhịa.

Ụfọdụ n’ime ndị ahụ a tọọrọ nọrọ ihe ruru otu afọ n’aka ndị omekome ahụ tupu a gbapụta ha. Mmadụ iri abuo na ato ikpeazụ a tọọrọ na mwakpo a nweere onwe ha

Akụkọ kwuru ndị ntọrị ahụ nara otu narị nde naịra maka otu onye n’ime mmadị 63 ha tọọrọ na mwakpo ahụ.

Naanị otu ọnwa gara aga,abali ise nke onwa Disemba  2022, ka njem malitekwara ọzọ n’okporo ụgbọ oloko Abuja-Kaduna.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *