Take a fresh look at your lifestyle.

Anwụchiela onye uweojii a sị gbagburu otu nwoke na Legọs steeti na Tuzde

0 96

Ndị uweoji Legọs steeti ezipụtala ozi na ha nwụchiri otu onye otu ha a na-ekwu gbagburu otu nwaamadị onye nkiti a kpọrọ Gafaru Buraimoh na Tuzde n’akụkụ ogige ụlọ Happy Land Estate, Ajah.

N’ozi ha zipụtara n’akara Twitter taa bụ Wenezde, ndị uweoji Legọs kwuru na ha “anwụchiela ma jichie ya bụ onye uweojii dịka a napụrụla ya ngwa ọgụ ya niile.”

Ha kwukwara na ha ezigarala ezinaụlọ ya bụ nwaamadị ozi iti aka obi ma kwuo na ha amalite nnyocha zuruoke n’okwu mgbagbu ya bụ nwaamadị.

E kwuru na mgbọ tụgburu nwaamadị a n’abalị Tuzde ebe o si n’ụlọahịa Skymall na-apụta dịka ndị uweojii nke ụlọọrụ Ajiwe division na-achụ ndị na-ere mmanụ ụgbọala nke ha na-anataghị ikike gọọmentị ọsọ.

E kwukwara na ọgbaghara dapụtara n’etiti ndị a na-ere mmadụ nakwa ndị uweojii dịka ha jụrụ ka e jichie mmanụ ụgbọala nke mere ha jiri malite ịgba egbe ebe ahụ aghara aghara.

Leave A Reply

Your email address will not be published.