Take a fresh look at your lifestyle.

Drug Enforcement Agency Anwuchiela onye na atu mgbere ogwuike na Abia

0 846

Ulo oru n’ebu agha megide itu mgbere ogwuike na’ala Naijiria nke akporo National Drugs Laws Enforcement agency, NDLEA anwuchiela nwamadi a na atu mgbere ogwuike bu,Onyeaghalachi Stephen Nwagwugwu bu onye amalitere chowa kamgbe afo itolu.

Ulo orua mere ka amata nkea site n’onu na ekwuru ha bu, Mazi. Femi BabaFemi  kwuru na nwanne onye a na atu mgbere ogwuike bu, Eze Kaleb Stephen, bukwa onye ana acho acho,gbara oso mgbe ndi oru ha wakpuru ha na Umuahia na obodo Ntigha Okpuola nke okpuru ochichi Isiala Ngwa dina Steeti Abia.

Na ogea, enwetara ubara ogwuike cocaine na cannabis na ulo ha abuo ha.

“Ndi ulo orua gbachiri ulo oriri abuo,ulo obibi abuo,otu ebe ana eri nrinakwa ugbo ala ato ebe ana agba mbo ikuchi oba ego ha nakwa otutu akuluba ha.” Ka emere ka amata.

Ozia mere ka amata na umunne abuo malitere itu mgbere ogwuike kamgbe afo 1990na ime obodo ha,ebe ha nwekwa ndi omekome na eche ulo ha nakwa ebe ha na ere ogwuike.

Onyeisi ulo oru NDLEA bu, Retired Brig. Gen. Mohamed Buba Marwa toro ndi oru yam aka mbo ha gbara iji nwuchie onye ojoo a nakwa ndi agha ala anyi maka inyere ha aka,ma gwa onye nke gbara ka onyefe onwe ya n’aka NDLEA turu ha ejiri aka nwuchie ya.

Leave A Reply

Your email address will not be published.