Take a fresh look at your lifestyle.

Nkaa azụmahịa dika otu ihe e jiri mara ndi Igbo.

chigo dere ya.

0 272

Ihe ọzọ ọtụtụ ndị mara ndị Igbo bụ azụmahịa.

Ha na-ekwu na ụmụ Igbo chị ọkụ n’azụmahịa.

Ọ na-agba ndị mba ọzọ gharịị etu onye Igbo nwere ike ịbata obodo na enweghị ihe ọbụla karịa obere ngwaahịa mana e nye ya oge ọ tụtụjuo akpa ya.

Ọtụtụ na-eji ya ama ndị Igbo njakịrị na onye Igbo nwere ike iresị ndị Eskimo akụ mmiri igwe.

Nke bụ Eziokwu: Ịzụ na ire ahịa mara ndị Igbo ka ego mara Ojukwu.

Nke mere ọ bu ha bu ọka ibe n’Ahịa Ọnịcha, Arịrịa Aba, Mgbuka Nnewi, Nkwo Igbo, Ogbete Enugwu, Alaba Legọọsu dgz.

Leave A Reply

Your email address will not be published.