Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ndị na-azọ ndọrọndọrọ ọchịchị n’otu pati dị ịche ịche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

0 542

Ọtụtụ pati steeti ahọpụtala ndị ga-azọrọ ha ọkwa gọvanọ na osote ya na ntuliaka 2023 dịka ha merela ntuliaka imeụlọ pati ha.

Chọpụta nke steeti gi na pati ha:

N’Enugwu Steeti

PDP: Gọvanọ:  Ọkaiwu Peter Ndubuisi Mba

Bar. Peter Ndubisi Mba bụ onye ọka ikpe m abụrụ onye Owoh dị n’okpuru ọchịchị Nkanu East na Enugwu Steeti.

Mba nwe ụlọ ọrụ Pinnacle Oil and Gas nke na ere mmanụ agbịdị.

Ya bụ nwa amadị bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ama ama n’Enugwu, n’ihi na o jibuola ọkwa dịka kọmishọna na-ahụ maka ego n’Enugwu ya nakwa “Chief of Staff” n’okpuru Gọvanọ Chimaroke  Nnamani.

Ụlọọrụ ya bụ Pinnacle nwere ngalaba dị iche iche na Naijiria.

Osote Gọvanọ: Ọkaiwu Ifeanyi Ossai

Bar Ossai bụ onye ọka ikpe ma bụrụkwa otu na ndị welitere isi na pati PDP n’Enugwu.

Ossai bụ onye Nsukka dị n’ Enugwu steeti.

APC : Gọvanọ: Chief Uche Nnaji

Uche Nnaji bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama n’Enugwu steeti.

O jibuola ọkwa dịka kọmishọna n’Enugwu.

Uche Nnaji nwe ụlọọrụ a kpọrọ ‘Ouch Concepts  Limited’ ma bụrụ onye Nkanu dị n’Enugwu steeti.

Osote Gọvanọ: Ọkaiwu George Tagbo Ogara

Ọkaiwu Ogara bụ onye Unadụ nke dị na okpuru ọchịchị Igboeze-South n’Enugwu steeti.

Ọ bụ okaiwu ma bụrụkwa onye ojiegoachụegọ.

Ogara azọọla ọkwa gọvanọ Enugwu n’oge gara aga.

Labour Party: Chijioke Edoga

Chijioke Edoga bụ onye Nsukka dị n’Enuguwu steeti. Ọnọla mbụ na ụlọ one iwu House of Representatives n aokpuru pati PDP. Ọ bụkwara kọmishọna na-ahụ maka gburu gburu idi mma, tupu ọ gawa Labour Party maka ịzọ ọkwa Gọvanọ.

APGA: Gọvanọ: Frank Nweke

Frank Nweke II nke Apga na Edith Ugwuanyi na-azọ ọkwa gọvanọ Enugwu steeti na Osote bụ

Frank Nweke II bụ naanị onye na-azọ ọkwa gọvanọ n’Ọwụwa Anyanwụ ji nwaanyị mere Osote ya.

Nweke bụ onye Ozalla Nkanu n’Enugwu Steeti.

Ọ bụbụ minista na-ahụ maka mgbasa ozi na Naijiria n’oge Onyeisala Obasanjo na-achị.

Aha ụlọọrụ ya ‘Stellar Constellation Group.

Osote Gọvanọ: Edith Ngozi Ugwuanyi

Ọ bụ onye  Amachara Ovoko Igbo Eze south LGA. Ọ bụ onye ọrụ ahụ ike Nọọsụ ma bụrụkwa ọka mmụta na ebe ndị ọzọ. Ọzọlarịị ọkwa onye isi okpuru ọchịchị Ignoeze South ugboro abụọ n’oge gara aga. O nwekwara ọtụtụ Otu na-ahụ maka ahụ ike ụmụ nwaanyị na ụmụaka nakwa nke na-agbatara ndị ọnweghị ka ọ ha ha nkpu enyemaka.

N’Abia Steeti

PDP: Govanọ: Professor Uche Ikonne

Bụ ọkammụta n’ ‘Optometry’, jibu ọkwa Vice Chancellor nke Abia state University, bụkwara Rector nke Abia steeti Polytechnic.

Ọ bụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị doro anya.

Ikonne bụ onye Isiala-Ngwa North dị na Abia Steeti.

 Onye ọrụ agha nke mba Amerika lara ezumike. Ọ bụkwa oka ikpe, ma bụrụkwa onye isi oche okpuru ọchịchị Umunneochi n’oge gara aga.

 

 APC: Gọvanọ: Ikechi Emenike

Nwe ụlọ ọrụ a na -akpọ DER limited nke na ahụ maka iji ego akpata ego. Ọ bụ onye ọhụhụ Abia steeti ma nụrụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị

APGA: Ọkammụta Greg Ibe

Ọ bụ Okammuta ukwu ma bụrụkwa onye nwe Mahadum Gregory University Uturu Abia steeti.

Ọka mmụta Ibe bụ onye ndọrọ mdọrọ ọchịchị ma bụrụlwa onye jị eye akpata egọ n’ebe ọ dị ukwuu.

Osote Gọvanọ : Obinna Ichita

Obinna Ichita bụ onye na-anọchite anya Aba South n’Ụlọomeiwu Abia steeti .

Labour Party: Govanọ: Alex Otti

Onye ọrụ mgbakọ ego na akụnaụba a ma ama.

Nwa oge gara aga , Otti bụ onyeisi ụlọ ọba ego ‘Diamond Bank’.

Ọ zọọla ọkwa gọvanọ Abia steeti ọtụtụ oge tupu ọ banye Labour Pati.

Ebonyi steeti

PDP: Gọvanọ: Senetọ Obinna Ogba

Bụ sinatọ na anọchite anya Ebonyi Central na ụlọ one iwu nnukwu bụ sinate.

Ọ bụọla kọmishiọna na ahụ maka egwuregwu na Ebonyi steeti.

Deputy: Mr Oliver Osi

Bụ onye na anọchịte anya Ivo north na ụlọ ome iwu Ebonyi House of Assembly.

APC : Govanọ: Hon Francis Nwifuru

Bụ onye ama ama na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Ebonui steeti.

Nwaifuru ejiel ọkwa Speaker nke ụlọ ome iwu Ebonyi bụ House of Assembly ugboro abụọ. O bụ onye okpuru ọchchị Izzi west nke Ebonyi steeti.

APGA: Gọvanọ: Ọkammuta Benard Odoh

Benard Odoh bụ ọkammụta na ‘GeoPhysics. Ojibuela ọkwa dịka ode akwụkwọ nke gọmenti Ebonyi nakwa ọkwa dị iche iche ndị ọzọ.

Labour Party: Gọvanọ: Edward Nkwagu

Edward Nkwagu nwe ụlọ ọrụ a na-akpọ Edon Nigeria Limited. Ọ bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma bụrụkwa onye ọrụ Engineering.

Ọtụtụ pati na steeti dị ka Ebonyi na Aba ka nọ na kata kata ugbua n’ihi nkewa nke Bekee kpọrọ ‘faction’ na-etisasi udo na pati ha.

Ihe nkea pụtara bụ na ụfọdụ steeti nwere mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ka nọ n’ụlọ ike n’ekwu na ọ bụ ha nwetara mmeri.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *