Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe Gọvanọ Uzodimma sị bụ ọrụ ndị Ebubeagu n’Steeti Imo

0 454

Gọvanọ Imo Steetị bụ Hope Uzodimma ekwuola ụfọdụ ọrụ ndị otu nchekwa Ebubeagu nke steetị ya na-arụ.

O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ n’ụlọọrụ ntaakụkọ Channels TV na mgbe ụbọchị Tuzde.

Uzodimma sị na ọrụ ndị Ebubeagu na-arụ bụ ịbanye n’ime obodo dịka ndị nkịtị, sie imi n’ala ma chọpụta ozi dị mkpa banyere nchekwa ma gbaara ndị uweojii ama.

O kwuru na ndị otu a anaghị ebu egbe maọbụ ngwa ọgụ ọbụla n’ọrụ ha na-arụ.

Uzodimma sị na ọtụtụ mwakpo na mpụ ndị a sị Ebubeagu na-eme n’Imo steeti bụ asị ọcha, na ọ bụ aka ọrụ ndị ekperima chọrọ itinyere ndị Ebube Agụ aja na garị.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọrụ ndị Ebubeagụ na-arụ bụ ihe iwu ndị ụlọomeiwu steeti ya kwadoro, na ọ gaghị ekwe ka ndị ha buru ngwa ọgụ.

Mgbe a jụrụ ya banyere ọnọdụ ‘sit-at-home’, Uzodimma kwuru na enweghizi ihe dịka atụmatụ a n’Imo.

O kwuru na ndị mmadụ na-apụta gaa mkpa dịịrị ha n’ụbọchị Mọnde ọbụla, tinykwara na ndị ọrụ nchekwa kwụ chịm igbochi ọgbaghara ọbụla.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *