Take a fresh look at your lifestyle.

Aka kparala ndị na-esipụta mkpụrụ mmiri

0 581

Ụlọọrụ na-ebu agha megide ịṅụ ọgwụike bụ National Drug Law Enforcement Agency, NDLEA enyochapụtala ụzọ ebe abụọ a na-esi ọgwụike a ma ama dịka mkpụrụmmiri dị n’Anambra nakwa Legọs steetị.

Onyeisi ụlọọrụ a bụ Brig. Gen Mohamed Buba Marwa gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ebe ndị a ka na-esipụta ha ma kesaa na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa.

Ọ kwuru site na oke mpụta ihe ọgwụike a na ngwụcha afọ 2021 ọkachasị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nakwa akwa enyemaka ndị mpaghara a bere maka ihe ọ na-eme ndị ntoroọbịa, na ụlọọrụ ha kpebiri isi imi n’ala chọpụta ebe a na-esi ya bụ mkpụrụmmiri.

Marwa sị na nyocha ha mere n’ime ọnwa asaa gara aga mere ha jiri chọpụta ma nwuchie mmadụ anọ, gụnyere osi ite nakwa mmadụ abụọ ọzọ ugbua.

Ọ sị na ọ bụ na Satode abali iri ato nke onwa Julaị ka ha chọpụtara ma wakpoo ụzọ ebe abụọ a na-esi ọgwụike a; nke mbụ dị na Victoria Garden City (VGC) dị na Legọs ebe nke ọzọ dị n’obodo Nise nke Steeti Anambra.

Ọ sị na ndị nwe ụlọ ebe a na-esi mkpụrụmmiri a bụ Chris Emeka Nzewi (Legọs) na Paul Ozoemenam (Anambra), ebe Sunday Ukah bụ osi ite na-esi ya bụ ọgwụike.

Ọ sị na Nzewi na-esi ọgwụike nke ya n’ime ụlọ ya na ezinaụlọ ya bi gụnyere nwata ka dị ọnwa atọ, na nke a nwereike imetụta ahụike ezinaụlọ ya.

Marwa gara n’ihu kwuo na kpachiri mkpụrụmmiri dị kilogram 258.74 n’ụlọọrụ ndị a ebe ha na-esipụta ihe dịka kilogram iri ise (50) kwa izuụka.

Ihe ndị ha kpachiri bụ igwe ndị e ji esi mkpụrụmmiri gụnyere cylinder, gaasị e ji esi ihe, ‘tube’, ite dị iche iche nakwa ihe mkpuchi imi (face mask).

Ọ sị na nwuchi ndị a nyeere ha aka ịchọpụta ọtụtụ ndị ọzọ aka ha dị n’ire nakwa ịṅụ mkpụrụmmiri.

Ọ dọrọ aka na ntị na mmiri ọjọọ si n’ebe a na-esi mkpụrụmmiri nwereike ibutere ndị bi gburu gburu ebe ahụ ọrịa ọjọọ.

Cheta na ọgwụike mkpụrụmmiri a wuru ewu na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n’afọ 2021.

Ọtụtụ ndị kachasị aṅụ mkpurummiri bụ ndị ntoroọbịa dịka ọtụtụ ihe onyonyo gosiri ka a na-apịa ndị ṅụrụ ya ihe n’ọha.

Nsogbu a butere ọnwụ ụfọdụ ụmụokoroọbịa bụ ndị a kugburu n’ihi ebubo na ha ṅụrụ mkpụrụmmiri.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.