Take a fresh look at your lifestyle.

Ahụike: VP Osinbajo ekwuputala obi ụtọ ya nye ndi Naijiria

0 549

Osote onyeisiala Naijiria bụ, Ọkanmụta Yemi Osinbajo ekwuputala obi ụtọ ya nye ndi ala anyi dika ọgbakechara na ahụike ya.

Ọkanmụta Osinbajo mere ka amata nkea site nke obinyere aka n’akwụkwọ bụ nke odeputara na igwe Twitter handle n’ụbọchi ụka bụ abali iri abụọ na anọ nke ọnwa Juuli, afọ 2022.

Ekelere m onye ọbụla maka ekpere ngbake n’ọria nke unu kpere maka mu. pic.twitter.com/Erk9r23E1G

— Prof Yemi Osinbajo (@ProfOsinbajo) July 24, 2022

“Ekelerem onye ọbụla maka ekpere unu ,ka mu gbakee n’ute ọria.

“Ekele puru iche na agara ndi dibia oyibo,ndi dọkita,ndi nurse , physiotherapists, nakwa ndi management nke Duchess International Hospital,dina Lagos, maka igwọ m ọria.

“Chukwu gozie unu.”

Osote onyeisiala gara ụlọọgwụ n’ụbọchi Satọọde abali iri na isii nke ọnwa Juuli,na Duchess International Hospital, Ikeja,nke Steeti Lagos.

Leave A Reply

Your email address will not be published.