Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Arthur Nzeribe alaala mmụọ n’afọ iri asatọ na atọ

0 27

Otu onye ezinụlọ ya kwuru na nke a mere eme n’ezie.

Dịka o si kwuo, Arthur Nzeribe nwụrụ n’ụlọọgwụ dị n’ala bekee.

Ezinụlọ Nzeribe mechara wepụta akwụkwọ ozi nke ha ji kwuo kpọmkwem na nna ha ukwu alaala mmụọ n’eziokwu.

Ha dere sị: “Ezinụlọ obi eze Nzeribe nke dị n’obodo Umudei, Oguta…na-ekwupụta ọnwụ nwa anyị, nwanne anyị, nna anyị na papa nnukwu anyị bụ Ichie Francis Arthur Uzoma Nzeribe.”

Arthur Nzeribe

“Ọ lara mmụọ n’abalị ise nke ọnwa Mee afọ 2022, ka ọ gbachara afọ iri asatọ na atọ (83).

“Ezinụlọ anyị ga-amalite emume na ihe ndị ọzọ dịka omenala anyị si dị, tupu anyị ekwupụta etu mmemme akwamozu ya ga-esi gaa.”

Ndị binyere aka n’akwụkwọ ozi ahụ bụ Francis Anyaegbu Nzeribe, Anthony Akpati Nzeribe na Oliver Nwedo Nzeribe.

Leave A Reply

Your email address will not be published.