Chris Ngige abụrụla onye ọhụrụ sonyere n’ogologo ahịrị ndị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisala Naịjiria n’afọ 2023.
Ngige bụ Minista na-ahụ maka Ọrụ na Inwe ọrụ, kwuputere mmasị ya iso zọọ ọkwa a n’ihu ọha gbakọrọ n’obodo ya n’Alor, n’ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ 2022.
O kwuru na ihe mere o ji azọ ọkwa a bụ na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ịhụ Naịjiria ebe ọganihu, ịdịnotu na nhatanha juputara.
Kemgbe o kwuputere mmasị ya, ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ ụdịrị ọchịchị ọ chọrọ ịchị ebe ụmụakwụkwọ mahadum agabeghi akwụkwọ kemgbe ihe karịrị otu ọnwa, n’ihi abụbụọrụ ndị nkuzi gbara maka ụgwọ e ji ha.
- A mụrụ Chris Nwabueze Ngige n’ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọst afọ 1952
- Ọ bụ onye Alor dị n’okpuruọchịchị Idemili South, n’Anambra steeti
- Ọ chịrị Anambra steeti dịka gọvanọ site n’ọnwa Mee afọ 2003 ruo Maachị afọ 2006, n’okpuru pati PDP
- O si pati People’s Democratic Party (PDP) wụbanye pati Action Congress of Nigeria (ACN) n’afọ 2011, nke so na pati ndị e kpokọtara iji hibe pati All Progressives Congress (APC)
- Ọ zọtara oche ụlọomeiwu ukwu ebe ọ nọchitere anya ndị Anambra Sentralụ site n’afọ 2011 ruo afọ 2015 mgbe Sinetọ Uche Ekwunife meriri ya na ntuliaka
- Ọ bụ minista na-ahụ maka Ọrụ na Iwe n’ọrụ kemgbe 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2015 ruo ugbua
- Aha otutu ya bụ Ọnwa.
Leave a Reply