Take a fresh look at your lifestyle.

Prezidenti Buhari enyela iwu ka eguzobe federal polytechnics atọ ọhụrụ

0 164

Prezidenti Muhammadu Buhari enyela iwu ka eguzobe ụlọ akwụkwọ Federal Polytechnics atọ ọhụrụ n’ala anyi.

Ozi sitere n’aka onye Direkto n’ahu mgbasa ozi na nmekorita ọhaneze nke ụlọ ọrụ Federal Ministry of Education bụ, Ben Bem Goong, kwuru na aga arụ ụlọ akwụkwọ ndia na Umunneochi dina Steeti Abia, Orogun dina Steeti Delta nakwa Kabo nke Steeti Kano.

Dika ozia siri kwuo,ụlọ akwụkwọ ọhụrụ a ga amalite agum akwụkwọ n’ọnwa Ọctoba afọ, 2022.

Nkea mere ka ọnụ ọgụgụ Federal Polytechnics nile enwere n’ala anyi bụrụ iri atọ na isii(36),ebe steeti nile enwere n’ala anyi nwe otu Federal Polytechnic.

Leave A Reply

Your email address will not be published.