Take a fresh look at your lifestyle.

Eya Guezguez nke mba Tunisia anwụọla ka ụgbọ ya kpuru

0 237

Onye okwu ụgbọ mba Tunisia bụ, Eya Guezguez,bụ onye soro na ihe egwuriegwu Tokyo Olympics n’afọ gara aga,anwụọla na dika ọgbara afọ iri na asaa nwuru ka ụgbọ oji akwado kpuru ya na ejima nwanne ya nwanyi bụ Sarra,bukwa onye meruru ahụ, International Olympic Committee (IOC) bụ ndi mere ka amata nkea n’ụbọchi Mọnde.

Guezguez bụ onye yana ejima ya soro jee egwuriegwu na Tokyo,ka ndi IOC kwuru na ụgbọ ha kpuru n’ụbọchi ụka dika oke ifufe n’efe,ndi IOC ekwughi ebe odachi a nọrọ mee.

IOC Prezidenti Thomas Bach kwuputara obi nwute ya maka ọnwụ nwada a.

“Egwu tụrụ m ka nuru ozi banyere ọnwụ Eya Guezguez. Nwada a bụ onye mara nke ekwe kuru na egwuriegwu ikwu ụgbọ ma bụrụ onye ụmụ n’etoeto na elekwasi anya,” Bach kwuru nkea.

Leave A Reply

Your email address will not be published.