Take a fresh look at your lifestyle.

Ọzọ ndị ọjọọ si anazi ụtụisi n’Anambra

0 886

Gọomentị Steeti Anambra akọwaala etu ndị ekperima, ndị ntọrị na ndị ohi si anazi ụtụisi na steeti ha n’aha ịchọta mnwereonwe Biafra.

N’ozi gọọmentị wepụtara, ha sị na nke a na-eme n’ụfọdụ obodo ndị dị n’okpuruọchịchị Ihiala, Nnewi South na Aguata.

N’okwu ha “Ị ma na ebe ndị dịka Ihiala, Nnewi South na Aguata, ndị mmadụ na-akwụ ụtụisi n’aka ndị ekperima tupu ha echie echichi, gbaa nkwụ di na nwunye, kwaa ozu nakwa mee emume ndị ọzọ n’obodo.”

“Ndị ekperima a na-ana ụtụisi n’aka ndị na-azụ ahịa, ndị na-akwọ ụgbọala kwa ụbọchị, kwa izuụka na kwa ọnwa ọbụla.”

Gọọmentị sị na ndị a na-anapụ ndị mmadụ ụgbọala ha n’ike, zoo ha n’ime ọhịa ma na-eche ka a bịa zụọ ụgbọala ndị a n’aka ha.

“Ha na-atọrị ndị mmadụ ma yie ndị ọzọ egwu iji napụta ha ego.”

“Ihe ndị a bụ aka ọrụ ndị ekperima chọrọ ịkpachi mpaghara Anambra South ma ọ bụrụ na anyị ebilighi megide ma chọpụta ha.”

“Ị hụ ọtụtụ ụgbọala nke ndị Anambra nwe nke a na-apụrụ ndị nwe ha n’ike. Ha na-ebi ndụ ha site n’ịkpachapụ ndị obodo ihe ha jiri biri n’aha ịlụ ọgụ mnwereonwe Biafra, ma na-enupuisi n’iwu otu ndị chọrọ mnwereonwe Biafra hiwere.

O nwere ihe ọzọ ndị ogbu ọ raa ọbara a na-achọ na-abụghị mnwereonwe Biafra nke ndị mmadụ na-amaghị.

Gọọmentị gara n’ihu rịọ ndị Anambra ka ha ekwela ka ndị ekperịma na ndị ntọrị chụpụ ha na steeti n’aha ịchọ nwereonwe Biafra.

Cheta na nso nso a gọvanọ Soludo nke Anambra Steetị sị na ndịagha Naịjirịa wakporo ogige ndị a ekperima a ma chọpụta akwụkwọ bucha aha ndị a tọọrọ nakwa ego ole e jiri gbapụta ha.

Ọ kpọkwara oku ọzọ ka sị ka ndị niile bu egbe wụsaa nkwa agha ha ma bịa ka a kpaa nkata udo.

Kedụ ihe Ipob kwuru?

Otu na-achọ mnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) site n’ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola na ọ bụghị ndị otu ha na-akpa ike ndị a.

Ọ sị na ọ bụ ndị ‘o so chi egbu’ na-eme ihe niile a iji mebie aha nakwa atụmatụ mnwereonwe Ipob na-achọ.

Powerful sị na oge na-adịghị anya na ha ga-agba ndị niile na-eme ihe n’anwụ iji gosi na aka ha dị ọcha.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *