Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Mmadu 422 bụ Ndi butere ọria COVID-19 ọhụrụ

0 57

Ọnụ ọgụgụ ndi nwetara ọria COVID-19 n’ala Naijiria di mmadu nari anọ,iri abụọ na abụọ ka ọdi ugbua.

Ọbụ ndi ụlọ ọrụ Nigeria’s Centre for Disease Control NCDC mere ka amata nkea na ụbọchi Wenezdee site oba Facebook page ha.

Dika NCDC si mee ka amata“mmadu nile a butere ya bụ ọrụ si steeti iri na ise,nke gunyere – Steeti Rivers (178), Kwara (87), FCT (57), Borno (20), Kaduna (17), Plateau (14), Katsina (12), Delta (6), Edo (6), Jigawa (6), Anambra (5), Ekiti (5), Oyo (5), Ogun (3), Nasarawa (1)”

Ndi ọrụ mekwara ka amata otu onye bụ onye nwụrụ na ọria gba gburu  gburu ala anyi.

Nkea mere ka ọnụ ọgụgụ mmadu nile bụ ọria buru puku nari abụọ iri anọ na itolu,otu nari iri ise na anọ ebe mmadu puku nari abụọ iri abụọ,otu nari iri itolu na ise bụ ndi gbakerela ebe mmadu puku atọ iri asato na isii bụ ndi larar mụọ.

Leave A Reply

Your email address will not be published.