Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Sienate Prezidenti, n’ogbo ya eruola uju maka ọnwụ Shonekan

0 56

Prezidenti nke Naijiria Sineti bụ, Ahmad Lawan,eruola uju maka ọnwụ onye jibu ọkwa onyeisiala bụ, Chief Ernest Shonekan, bụ onye lara mụọ n’ụbọchi  Tuzdee na agbata afo iri asatọ na ise.

Sinetọ Lawan jikwa oherea kasie ezin’ụlọ Chief Shonekan obi, Gọọmenti na ndi steeti Ogun obi  maka ọdachia nwamadi a jibu ọkwa onyeisiala Naijiria.

Na okwu ya n’ụbọchi Tuzdee,Sineti Prezidenti kwuru na, “anam akasi ndi ezin’ụlọ Chief Shoneka obi, the Gọọmenti na ndi steeti Ogun nile obi nakwa ndi ala Naijiria maka oke ọdachie a.

  “Chief Shonekan bụ onye ọkiwu, onye mara maka azụm-ahia,onye nkuzi nakwa onye ndu obodo ka aga echeta maka ọrụ ọma ya nile n’ala Naijiria.”

Lawan kpere ekpere ka chineke nabata mkpụrụ obi nwamdi a n’ala eze ya,ma kasikwa ndi nile nkea metụtara obi.

Ony e jibu ọkwa sineti Prezidenti bụ, Sinetọ David Mark, kọwari nwamadi a jibu ọkwa onyeisi ọchichi nchere oge ala anyi bụ, Chief Ernest Shonekan, dika ezigbo nwafọr bụ onye nyere onwe ya maka ọdi nma ala Naijiria.

Sinetọ Mark kwara gọọmenti etiti ka kwanyere Shonekan ugwu dika ezi onye ndu,bụ onye nyere ihe nile ya maka ọdi nma ala anyi ihụ na enwere udo na idin’otu.

Leave A Reply

Your email address will not be published.