Take a fresh look at your lifestyle.

AFCON 2021: otu Super Eagles emeriela ndi Pharaoh’s nke Egypt

0 513

Otu egwu Super Eagles nke Naijiria emeriela ndi Pharaohs  nke mba Egypt site na igba ha otu  ọkpụ n’asaghi asa,na asampi mbụ ha n’iko African Cup of Nations n’ụbọchi  Tuzdee na Garoua, Cameroon.

Ka ọdi ugbua otu Super Eagles, bụ ndi no n’elu na Group D site na nmeria ha meriri ndi mba Egypt.

Ọ bụ Austin Eguavonbu onye  technical director otu egwu Super Eagles mere ha ji mee nke oma.

Moses Simon, Wilfred Ndidi, Samuel Chukwueze, Joe Aribo nakwa William Troost-Ekong bụ ndi so malite asompi a.

Kelechi Iheanacho bụ onye nyere  otu  golu a ka owetere aka na nkeji iri atọ amalitere egwuri egwu a,ebe Taiwo Awoniyi nyere ya aka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *