Browsing Category
Mba ụwa
Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe ha sitere n’okike dị n’ime ala
Ndị ọchịchị mba Yukren kwuru na Yukren ekwetala ịnye mba Amerịka ikike inwere ihe sitere n’okike dị n’ime ala.
Ha gwara ndi ntaakuko na mba Yukren kwetara nkwekọrịta nke mba Amerịka nyere ha mana ha mere ọtụtụ mgbanwe n’ime ya ka o nwere…
Mba Amerịka ga-achụla ọtụtụ ndị Naịjirịa
Gọọmenti mba Amerịka ekwuola na ha ga acgụla mmadụ nari abụọ na otu dịka Onyeisiala Donald Trump na-aga n’ihu ibu agha megide ndị na-enweghị akwụkwọ ikike ibi na mba Amerịka.
Ndị ahụ a ga-achụla gụnyere ndị a tụrụ mkpọrọ nakwa ndị mere…
Mmadụ niile nọ n’ụgbọelu ahụ kụkpọrọ n’ọdụụgbọelu Toronto ji ndụ ha pụta
Akụkọ ekwuola na mmadụ niile na-eme njem na ndị ọrụ ụgbọelu ahụ kụkpọrọ n’ọdụụgbọelu Toronto Pearson Airport dị na mba Kanada ji ndụ pụta.
Ozi si n’aka onye ọrụ Greater Toronto Airports Authority bụ Deborah Flint kwuru na obi dị ha aṅụrị…
Trump ataala Yukren ụta maka ịmalite agha ha na mba Rọshịa
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump arụọla ogbo ya nke Yukren bụ Volodymyr Zelensky aka maka ikwu na akpọghị ha oku isonye na mkparịtaụka mere na Saụdị Arebịa maka ịkwụsị agha ha na Rọshịa.
O kwuru na ọ tụrụ ya n’anya n’ihe Yukren…
Mba Briten “ga-eziga” ndịagha ha na Yukren maka nchekwa udo
Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer ekwuola na “ọ dị njikere” itinye ndịagha ha na mba Yukren iji nye aka chekwaa udo na mpaghara ahụ.
O kwuru na inweta udo ga-anọte aka na mba Yukren dị “oke mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ igbochi…
Yukren agaghị eso mee mkparịtaụka udo mba Amerịka na Rọshịa kwadọro
Otu onyeisi na gọọmentị mba Yukren ekwuola na mba ahụ agaghị eso eme mkparịtaụka udo ahụ nke mba Amerịka na Rọshịa chọrọ ka e mee na mba Saudi Arabia.
Onye ahụ gwara ndi ntaakuko na mba Yukren enwetebeghị akwụkwọ ozi sị ha bịa n’ọgbakọ…
Ndị ndu Yurope ga-enwe ọgbakọ pụrụiche banyere ọnọdụ Yukren
Ndị ndụ mba Yurope ga-enwe ọgbakọ pụrụiche banyere agha na-eme na mba Yukren n’izuụka na-abịa abịa, maka na mba Amerịka na Rọshịa chọrọ inwe mkparịtaụka udo nke nwereike igbochi ndị Yorupe esola.
Praịm mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer…
Izrel sị ha ga-amalite ịkwa mgbọ ma Hamas atọpụghị ndị ha ji n’agbụ n’ụbọchị Satọde
Praịm Minista Izrel bụ Benjamin Netanyahu adọọla Hamas aka na ntị na ha ga-amalite ibu agha kpụ ọkụ n’ọnụ ọ bụrụ ma ha ahapụghị ndị ha ji eji n’etiti ụbọchị Satọde.
Netanyahu sị na ya enyela iwu ka ndịagha Izrel were ọnọdụ n’ime Gaza…
Anyị ga-eyigharị ụbọchị a ga-atọhapụ ndị Izrel e ji eji – Hamas
Ọnụ na-ekwuchitere ndịagha Hamas ekwuola na ndị otu ahụ ga-agbatị oge ha ga-eji tọhapụ ndị Izrel ha ji eji ma kwuo na nke ahụ bụ n’ihi na Izrel nupụrụ isi na nkekọrịta ịkwụsị ịkwa mgbọ.
E kwesịrị ịtọhapụ mmadụ atọ e ji eji na Gaza…
Ndịagha Izrel apụọla na mpaghara Netzarim kewara Gaza ụzọ abụọ
Ndịagha Izrel ewezugala ahụ na mpaghara Netzarim ogige ndịagha kewara mpaghara Nọt na Saụt Gaza.
Ọtụtụ narị ndị Palestinia malitere iburu ngwongwo ha laghachi mpaghara Nọt Gaza ebe e nwere ọtụtụ mbibi oge gara aga dịka ndịagha ahụ…