Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Akwụsịla Onyeisi EFCC Ọrụ

Rahila Lassa dere ya na bekee

0 377

Onye isi ala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu, GCFR na Wednesde, kwadoro nkwusioru ebighi ebi nke onyeisi oche, Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) Maazị AbdulRasheed Bawa, iji nye ohere maka nyocha nke ọma banyere omume ya mgbe ọ nọ n’ọchịchị.

Dị ka nkwupụta nke onyeisi nke Ozi nye ode akwụkwọ Gọọmenti etiti, Willie Bassey si kwuo, nke a na-esote ebubo dị arọ nke e boro ya.

Ọ gbakwụnyere, “Enyerela Maazị Bawa iwu ka ọ nyefee Director, Operations nke Kọmishọn ahụ ihe omume nke ụlọ ọrụ ya ozugbo, onye ga-ahụ maka ihe omume nke ụlọ ọrụ Onye isi oche ruo na ngwụcha nnyocha ahụ,”  ọ gbakwụnyere.

Ka ọ dị ugbu a, Department of State Services(DSS) kpọrọ Bawa ka ọ bịarute n’ụlọ ọrụ ha na mgbede Wenezde.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *