Ụlọ ọrụ nchekwa Department of State Services (DSS) akpọọla onyeisi oche nke Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) a kwụsịrị ọrụ bụ Mazị Abdulrasheed Bawa.
Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze DSS, Peter Afunanya, mere ka a mara nke a n’ozi o depụtara n’akara Twitter ya n’uhuruchi Wenezde, Juun 14, 2023.
Ọ kọwara na ọkpụkpọ òkù ahụ metụtara ụfọdụ ọrụ nnyocha gbasara ya
Nke a na-esote nkwado Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na nkwusioru Bawa na-akaghị aka ”Iji nye ohere maka nnyocha nke ọma gbasara omume ya mgbe ọ nọ n’ọkwa ọrụ.
Leave a Reply