Take a fresh look at your lifestyle.

Nnyefe Ọchịchị: Sanwo-Olu, Hamzat Aṅụọla Iyi Ọrụ Dịka Gọvanọ Lagos Na Osote Ya.

0 396

Babajide Sanwo-Olu na Obafemi Kadri Hamzat abụrụla Gọvanọ na osote gọvanọ Legọs steeti maka oge nke abụọ.

Hamzat ṅụrụ iyi ọrụ mgbe o jiri nkeji iri abụọ na itoolu gafee elekere iri na otu nke ụtụtụ, ebe Sanwo-Olu ṅụrụ iyi mgbe nkeji iri anọ na otu gafechara elekere iri na otu nke ụtụtụ.

Ndị nwunye mmadụ abụọ a bụ Dọkịta Ibijoke Sanwo-Olu na Oluremi Hamzat na ụmụ ha nọnyere n’oge mmemme ahụ.

Sanwo-Olu nyochara ngagharị nke ndị uwe ojii, ndị otu afọ ofufe, ụmụ akwụkwọ na ndị ọzọ jikọrọ aka ọnụ were mee.

Ọ bụ Ọkaikpe steeti ahụ bụ Justice Kazeem Alogba duru gọvanọ na osote ya n’iyi ọrụ ahụ.

Ndị ama ama sitere na mpaghara steeti ahụ dị iche iche bịara nọnye ka ha hụ mmemme nnyefe ọchịchị gọvanọ na osote ya nke ugboro abụọ.

Nkọwa ndị ọzọ na-esote n’azụ ……..

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *