Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuliaka Ndị Omebeiwu: Gọvanọ Osun Steeti Ekwupụtala Fraịdee Dịka Ụbọchị Ezumike.

Segun Adegoke dere ya na bekee

0 362

Gọvanọ Osun steeti, Sinetọ Ademola Adeleke ewepụtala ezumike ọha n’ụbọchị Fraide tupu ha eruo nhọpụta ụlọ omebe iwu steeti ahụ nke a ga-eme n’ụbọchị Satọde.

Nke a dị n’akwụkwọ ozi nke ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ, Mallam Olawale Rasheed binyere aka nke onye ntaakụkọ anyị nwetara n’Osogbo na Tọzdee.

Dị ka ozi ahụ si kwuo, ezumike ahụ bụ iji mee ka ndị bi na steeti ahụ gaa na ngalaba ntuliaka nke ha iji tụọ vootu na Satọde.

Ozi ahụ gara n’ihu dụọ ndị bi ebe ahụ ọdụ ka ha nọrọ n’udo ma na-erube isi n’iwu ka ha na-akwado maka ntuli aka ahụ.

O kwukwara na Gọvanọ kwuru: “Ana m akpọku ndị Osun ka ha pụta n’igwe tinye akwụkwọ ma were ikike dịịrị ha.

“Ntuli aka a dị oke mkpa n’ihi na ụnụ ga-ahọpụta ndị omebe iwu ga-eso m rụọ ọrụ. Ụnụ ga-emerịrị ntuli aka a etu o kwesiri”, Adeleke kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *