Onyeisiala Muhammadu Buhari akpọọla ya ihe na-awụ akpaata oyi n’ahụ, nloghachi mwakpo ndị na-eyi ọha egwu na igbu ọchụ nke ọtụtụ mkpụrụ obi aka ha dị ọcha na mpaghara ọchịchị Zangon Kataf na steeti Kaduna.
Ya mere ọ rịọla ka e jide ndị mere mpụ a ngwa ngwa ma taa ha ahụhụ.
Onyeisiala Buhari kwuru:
“A na-alụ ọgụ ọnụ megide ụmụ amaala aka ha dị ọcha na steeti ahụ. Ndị ọrụ nchekwa na ndị mmanye iwu ga-emerịrị ihe siri ike iji kwụsị nke a.
“Anam akasi ezinụlọ ndị e gburu na mwakpo a jọgburu onwe ya obi. Ka mkpụrụ obi ha zuru ike.”
Leave a Reply