Take a fresh look at your lifestyle.

Ebere bụ nwada hapuru oru ya maka fụwa ọja

0 582

Ebele Eziamakam bụ nwaanyị mbụ bidoro ịfụ ója Bekee a kpọrọ Flute na Naijirịa.

Ebele bidoro ịfụ Flutu kamgbe ọ dị afọ iri na anọ.

O kwukwara na ọ bụ nna ya zụtara ya Flutu mbụ ya ma sị na kamgbe ahụ, ọhapụbeghị ịfụ Flutu.

Ebele rụburu ọrụ dịka onye mgbakọ ego tupu ọ kwụsị ọrụ ya were banye ịfụ flụtụ n’uju ya.

Ọ kọwara na onyeisi ọrụ ya achọghị ka ọ hapụ ọrụ ya ma sị ya na Naijirịa agaghị enyere ya aka dịka nwaanyị na-afụ ọja.

Kama Ebere kachiri obi ma dịka emechara, onyeisi ya n’ọrụ mechara gwa ya na o ji ya eme ọnụ.

Ụlọọrụ ya ahụ mechara kpọọ ya ka o gbuoro ha ọja ma kwụo ya otu nde.

Ebele na ụfọdụ ndị dịka Tee Mac na Cobhams arụkọọla ọrụ mbụ.

Na akụkọ a ka o kwuru maka ihe na-echere ya aka mgba dịka nwaanyị na-afụ ọja na ebe ọ na-atụanya flutu ka akpọrọ ya gaa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *