Ọ dịghị mkpa maka iyi egwu ịchụpụ onyeisiala Buhari – Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi.
Timothy Choji, n' Abuja dere ya na bekee.
Ọ dịghị mkpa maka iyi egwu ịchụpụ onyeisiala Buhari – Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi.
Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi na omenaala Naịjirịa, Lai Mohammed ekwuola na ọ dịghị mkpa iyi egwu ịchụpụ onyeisiala Muhammadu Buhari ma ọ bụrụ na o kwughị nsogbu nchekwa dị ugbu a na-eche obodo ahụ ihu ka a na-eme ihe niile iji dozie nsogbu ahụ.
Mịnịsta na-aza n’aha gọọmenti Naijiria, ka ụfọdụ ndị omebe iwu nyere onye isi ala ohere izuụka isii ka o leba anya n’okwu a ma ọ bụ na-aga n’ihu na-ekpe ikpe nchụpụ,
Mohammed kwuru nke a na n’ajụjụ ọnụ ya na ndị nta akụkọ House mgbe nzukọ Virtual Federal Executive Council (FEC) mere na Wednesdee na Abuja, isi obodo mba ahụ.
Ndị omebe iwu sitere na pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide, gụnyere People’s Democratic Party (PDP), All Progressives Grand Alliance (APGA), na ụfọdụ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC), tara onyeisiala Buhari ahụhụ na Wednesde maka ọnọdụ nchekwa obodo na-akawanye njọ, na-enye ọ ga-ewe izu isii iji dozie okwu a ma ọ bụ chee ikpe nchụpụ.
rụ oge niile, awa 24, iji hụ na a na-achịkwa ọnọdụ ahụ. .
Leave a Reply