Take a fresh look at your lifestyle.

EFCC NWUCHIRI AKA CHIBURU STEETI ANAMBRA.

0 646

EFCC NWUCHIRI AKA CHIBURU STEETI ANAMBRA.

Obiano bụ aka chiburu Anambra steeti site n’afọ 2014 ruo 2022 bụ onye Aguleri nke dị n’okpuruọchịchị Anambra North.

O ji ọkọlọtọ ndị All Progressive Grand Alliance, APGA, were chia Anambra steeti Afọ asatọ.

Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC), nwụchiri  ya n’ọdọụgbọelụ Murtala Mohammed International Airport dị na Legọs steetị ụnyaahụ bụ Tọọzde ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Maachị 2022.

Nke a mere ka ọ nyefechere ọchịchị Anambra steeti n’aka Gọvanọ Charles Soludo ụnyaahụ, na-emezị njem nke a sị na ọ bụ mba ofesi ka o zubere ịga tupu anwụchie ya.

EFCC kwuru: “ọteela anyị ji arọ ya anya mana iwu nchekwa ndị nọ n’ọchịchị nke Bekee kpọrọ “immunity” ekweghị anyị ruo ya nso. Mana ya bụ “immunity” gwuru ụnyaahụ, nke mere anyị jiri nwee ohere ịwụchi ya”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *