Oriakụ Oluremi Tinubu,Nwunye onye isi ala Naijiria, na-eme emume ncheta maka ụmụ nwanyị na Naijiria ,
Timothy Choji, Abuja
Oriakụ Oluremi Tinubu,Nwunye onye isi ala Naijiria, na-eme emume ncheta maka ụmụ nwanyị na Naijiria ka ụwa na-eme emume ụbọchị ụmụ nwanyị mba ụwa.
N’ozi maka ncheta ụbọchị ahụ, O ji nganga gosi na ntinye aka ụmụ nwanyị na-enye maka mmepe obodo.
Ọ sịrị: “Taa, n’ụbọchị ụmụ nwanyị mba ụwa, a na m eme emume nwanyị ọ bụla – Ụmụ nwanyị, Ụmụnne nwanyị, nwanne nne, nne, nne nne, na kwa ndị nne ochie, maka nkwụsi ike gị, agụụ gị, na obi ike nke wetara anyị ruo ugbu a.
N’ịnọgide na isiokwu maka mmemme nke afọ a, Oriakụ Tinubu kwadoro itinyekwu ego n’ime ụmụ nwanyị iji kwado ha maka ijere mba ọzọ ozi.
“Isiokwu n’afọ a na-ada ụda nke ukwuu -” itinye ego n’ime ụmụ nwanyị: mee ka ọganihu dịkwuo elu.
Leave a Reply