Browsing Category
Mba ụwa
Ihe Onyeisiala Trump kwuru n’oge emume ụbọchị otu nari n’ọfịs ya
Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump emeela emume ụbọchị 100 n’ọfịs kemgbe ọ malitere ọchịchị nke abụọ dịka Onyeisiala.
N’ozi ya, o kwupụtara ihe ndị ọ rụzuru na imegide ndị iro ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị.
N'ịkwado ihe ọ kpọrọ "mgbanwe…
A kpụgaala nwoke a na-enyo enyo ụlọikpe maka ụgbọala gburu mmadụ iri na otu
E boro otu nwoke dị afọ iri atọ (30) ebubo igbu ọchụ mgbe ụgbọala ya kwọbatara ebe igwe mmadụ na-eme emume n'okporoụzọ dị na Vancouver nke Kanada, ma gbuo opekata mpe mmadụ iri na otu (11) ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ.
Ndị uweojii…
Onye nnọchianya Vatịkan akpọọla oku udo na Saụt Sudan iji sọpụrụ Popu
Onye nnọchianya Saụt Sudan na Vatịkan agwala ndị ndu mba ahụ mkpa ọ dị ịkwụsị agha iji kwanyere Popu Francis ugwu.
Achịbishọp Séamus Patrick Horgan kwuru na, "Anyị ga-agba mbọ ịhụ na anyị gosipụtara ezigbo udo na ndụ ndị Saụt Sudan,…
Praịm Mịnịsta Kanada akatọọla agwa nwoke ahụ kwọbara ụgbọala n’emume festịvalụ okporoụzọ na…
Praịm Mịnịsta Kanada Mark Carney ekwupụtala mwute ya n’agwa nwoke ahụ kwọbara ụgbọala ya n’ebe ndị mba Philippine na-eme emume festịvalụ na Vancouver nke gbuo mmadụ itolu ma meruo mmadụ iri abuo ahụ.
O kwuru na ndị uweojii kwuru na nwoke…
Vitali Klitschko:Ka udo were di mba Ukren nwere ike inye mba Rọshịa ala…
Vitali Klitschko:Ka udo were di mba Ukren nwere ike inye mba Rọshịa ala...
Popu Francis anwụọla n’afọ iri asato na asato – Vatican kwuru
Onyeisi ụka Katọliki n’ụwa niile bụ Popu Francis anwụọla n’afọ iri asatọ na asatọ (88) dịka Vatịkan siri kwuo.
Vatịkan kwuru na ọ nwụrụ n’ụlọ ya dị na Casa Santa Marta nke Vatịkan.
Kadịnal Farrell kwuru: "O jiri ndụ ya niile ijere…
Zelensky akatọọla okwu Putin dịka Yukren na Rọshịa na-atụ onwe ha aka maka igbochi nkwa…
Rọshịa na Yukren na-ebo onwe ha ebubo igbochi mkpebi nkwa 'nkwụsịtụ ọgụ Ista' kwesiri ịnọ awa iri ato.
Onyeisiala Yukren bụ Volodymyr Zelensky kọwara okwu Onyeisiala Putin na-achị Rọshịa dịka nke uru na-adịghị maka na e nweela mwakpo…
Popu pụtara n’Ista Sọnde mgbe ọrịachara ọrịa siri ike
Onyeisi ụka Katọlik n’ụwa niile Popu Francis apụtala maka inye ngọzị Ista Sọnde n’ogige St Peter dị na Vatican, ebe a na-akwado maka emume ahụ.
A maghị ma Popu ahụ dị afọ asatọ na asatọ (88) a ga-esonye ụka ụbọchị Ista n’ihi na ọ hapụrụ…
Maka US irite na ikerita ngwa aku chinyere nke Ukarine:Ukarine na US binyere aka ma nwee nkwekọrịta
Maka US irite na ikerita ngwa aku chinyere nke Ukarine:Ukarine na US binyere aka ma nwee nkwekọrịta
Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Trump agbanyeghị uto ha
Chaịna adọọla aka na ntị banyere mmetụta tarifu Onyeisiala Donald Trump tinyere na mbubata si mba dị iche iche abata Amerịka, ga-enwe n’akụnaụba Chaịna agbanyeghị uto 5.4% mba ahụ nwere na nkeji mbụ nke afọ.
Ọnụọgụgụ ahụ meriri atụmanya…