Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka nwereike ịwakpo mba Ịran

0 575

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ndị ọchịchị mba Iran akpọọla oku ka ha nwee mkparịtaụka udo.

Trump kwuru na ọ bụ eziokwu na mba Amerịka na Iran nwereike inwe mkparịtaụka mana ya nwereike iwakpo ha tupu ha enwee mkparịtaụka ahụ.

N’okwu ya oge ndị ntaakụkọ juru ya ka mba Ịran emejọrọ ya site n’ogbugbu e gburu ndị na-eme ngagharịiwe, Onyeisiala Trump kwuru na mba Ịran mejọrọ ya site n’etu ha si mee ihe n ngagharịiwe a.

O kwuru na mba Amerịka na-eme nnyocha ma na-atụle ihe ha nwereike ime.

Cheta na Onyeisiala Trump yiri mba Iran egwu ma kwuo na mba Amerịka ga-awakpo ha ma ọ bụrụ na ha gbuo ndị na-eme ngagharịiwe.

O mere ka o doo anya na ọ gwara ndị ọchịchị mba Ịran na Amerịka ga-azaghchi ha ma ọ bụrụ na ha gbaa ndị ngagharịiwe egbe.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *