Browsing Category
Isiokwu
Onyeisiala Tinubu Na-Eru Ụjụ Onye Bụbu Onyeisi ASUU.
Onyeisiala Bola Tinubu egosila mwute dị ukwuu maka ọnwụ nke ọkà mmụta akwụkwọ a ma ama na onye bụbu onye isi nke Academic Staff Union of Universities (ASUU), Ọkammụta Biodun Jeyifo.
Onyeisiala kọwara Jeyifo nwụrụ anwụ dị ka onye nwere…
Ndị Uwe Ojii Anapụtara Onye A Tọọrọ Na Steeti Gombe
Ndị Uwe Ojii nke Steeti Gombe ekwenyela na a zọpụtara otu nwoke dị afọ iri anọ na asatọ, mgbe a tọọrọ ya n'obodo Tingile, mpaghara Birin Fulani nke okpuru ọchịchị Nafada.
Ndị Uwe Ojii kwuru na nke a mere n'ihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ…
Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt enweela nsogbu injini
Ụgbọelu Arik Air si Legọs aga Pọtakọt gbalahụrụ ihe mberede dịka o nwere nsogbu injini ụbọchị Wenezde.
Nsogbu ahụ mere ka ya bụ ụgboelu gaa kwụsị na ntụmadị n'ọdọụgbọelu Bini taa.
Mana o nweghị onye merụrụ na ndapụta ahụ.…
Pete Edochie dị ndụ
Ezinaụlọ ochie dike a ma ama na-eme ejije bụ Pete Edochie ekwuola na nna ha ka dị ndụ ma gbasiekwa ike.
Nke a na-abịa dịka akụkọ fesara ebe niile n'ụbọchị Tuzde 10 Febụwarị 2026 na Maazị Edochie anwụọla.
Oge ọ na-agwa ndi…
Ọ naghị ewute m na Onyeisiala Tinubu wepụrụ m dịka Minista – Uju Kennedy-Ohanenye
Onye bụbu Minista na-ahụ maka ihe gbasara ụmụnwaanyị bụ Uju Kennedy-Ohanenye ekwuola na o nweghị ihe mwute maka mwepụ onyeisiala Naịjrịa bụ Bola Tinubu wepụrụ ya dịka minista.
O kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakukọ ụlọmgbasaozi …
Mmadụ itoolu anwụọla dịka a gbara egbe n’ụlọakwụkwọ dị na Kanada
Mmadụ itoolu nwụrụ ebe mmadụ iri abụọ na ise merụrụ ahụ mgbe onye ojiegbe wakporo ma gbee egbe n'ụlọakwụkwọ nakwa n'ụlọobibi dị na mba Kanada.
Ndị uweojii sị na a hụrụ ozu mmadụ isii n'ụlọakwụkwọ sekọndịrị ‘Tumbler Ridge’ dịka onye…
Ndị akaebe agwala ụlọikpe etu ndị ohi si wakpoo ma gbuo Somtochukwu Maduagwu
Ikpe a na-ekpe mmadụ iri na otu a na-enyo enyo gburu Somtochukwu Maduagwu bụ onye ntaakụkọ ụlọọrụ Arise News amalitela n’ụlọikpe dị n’Abuja dịka ndị a wuchiri n’ụlọikpe.
Nwoke a e boro ebubo na mmadụ iri ndị ọzọ ka e boro ebubo…
Onye isi ala Tinubu kwere nkwa na Naijiria ga-emeri iyi ọha egwu, ndị ohi
Onye isi ala Bola Tinubu ekwupụtala na Naijiria ga-emeri iyi ọha egwu na ndị ohi, na-akọwa ihe egwu nchekwa dị ka "nke a na-anabataghị" na nke dịpụrụ adịpụ na ụkpụrụ isi obodo.
N'ịkpọsa imeghe ọgbakọ nke abụọ National Economic Council…
Pope Leo XIV ekwupụtala iwe ya maka mwakpo ndị omekome n’ebe dị icheiche na Naịjirịa
Popu Leo XIV bụ onyeisi ụka Katọlik ekwupụtala iwe ya maka mwakpo ndị omekome na-eme n’ebe dị icheiche na Naịjirịa.
Popu Leo mere nke a ma kwuo na ya na-atụ anya na ndị ọchịchị na Naịjirịa ga-agba mbọ chekwaa onye ọbụla.…
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu nabatara ndị nnọchiteanya US Africa Command (AFRICOM) n’AsoVilla
Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na Sọnde ụbọchị 9 Febụwarị nabatara ndị nnọchiteanya sitere na United States Africa Command (AFRICOM), nke onye ọchịagha General Dagvin Anderson, duziri gaa na State House, n'Abuja.
Onye enyemaka…