Ọkaikpe nọ n’isi ikpe dị n’etiti ojiegoachụego bụ Linus Williams Ifijirika a ma ama dịka ‘Blord’ na Vincent Martins Otse a ma ama dịka VDM’ ewezụgala onwe ya n’ikpe ahụ n’ụbọchị Monde.
Ọkaikpe ahụ aha ya bụ Rita Ofili-Ajumogobia mere ka ndị ikpe ahụ metụtara mata nke a n’oge ọ kpọlitere ikpe ha.
Rita Ofili-Ajumogobia kwuru na ya ga-ezighachiri Ọkaikpe Ukwu nke Ụlọikpe Ukwu Etiti ka o nye ọkaikpe ọzọ ikpe ahụ.
Prince Wayne Chikezie Elijah bụ otu n’ime ndị ọkaiwu naanọchịtaanya Blord kọwara ihe mere dịka ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu.
Wayne sị na mkpebi ọkaikpe ahụ bụ ihe ha na-atụghị anya ya, mana ọ dị mkpa iji hụ na ugwu ụlọikpe dịịrị ya.
Cheta na Ụlọikpe tụbara Blord n’ụlọmkpọrọ abalị iri abụọ na ise, na mmalite ọnwa Eprelụ dịka ọ na-azara ọnụ ya n’akwụkwọ nke VDM gbara ya maka ebubo imetọ aha ya na ihe ndị ọzọ.
Leave a Reply