Take a fresh look at your lifestyle.

Ejidela ndị gburu otu nwaanyị na ụmụaka ya isii na Kano steeti

0 216

Ndị uweojii ekwuola na ha jidere mmadụ atọ so gbuo otu nwaanyị na ụmụaka ya isii na Kano steeti, mpaghara ugwu Naịjirịa.

Mkpamkpa ahụ kpara n’ụbọchị Fraịde n’ebe a na-akpọ Dorayi Chiranchi Quarters dị na Kano steeti.

A wakporo ezinaụlọ ahụ, gbuo nwaanyị na ụmụaka isii.

Mana nna ezinaụlọ ahụ bụ Haruna Bashir gbara ọsọ.

Ndị e gburu bụ Fatima Abubakar dị afọ 35 bụ nne ụmụaka ndị ahụ, nwa ya bụ Maimuna dị afọ 17, Aisha dị afọ 16, Bashir dị afọ 13, Abubakar dị afọ 10, Faruk dị afọ 7, na Abdussalam dị naanị otu afọ na ụma.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Kano steeti bụ Abdullahi Haruna Kiyawa kwuru na ha jidela mmadụ atọ a na-enyoenyo na aka ha dị na mkpamkpa ahụ.

Ọ kọwara na ọ bụ n’ime ụtụtụ ’12:10pm’ na Januwarị 17, 2026 ka ndị uweojii nwetere ozi na a wakporo ụlọ Haruna Bashir.

Mana Gọvanọ Kano steeti bụ Abba Kabir Yusuf kọtọrọ ihe mere dịka ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sunusi Bature Dawakin Tofa si kwuo n’ụbọchị Satọde.

Ọ kwere nkwa na ndị mere ihe ahụ ga-enwete ntaramaahụhụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *