Ndịagha nnupuisi M23 akpachiela ma nwere ọnọdụ n’obodo Bukavu, obodo kachasị ibu na mpaghara ọwụwa anyanwụ mba DR Kongo ma machie obi ọchịchị Gọvanọ mpaghara ahụ.
Ọtụtụ mmadụ pụtara n’okporoụzọ ma na-akụrụ ndịagha ahụ aka dịka ụgbọala ha batara obodo ahụ na-enweghị mgbochi ọbụla.
Nke a bụ obodo abụọ ha nwere ọnọdụ na ya ka ha nwechara ọnọdụ n’obodo Goma.
Gọọmenti mba Kongo agwala ndị obodo ka ha ghara ịpụta n’ụlọ ha iji gbochie mwakpo ndịagha ahụ.
Otu UN na ọtụtụ mba Yurop adọọla aka na nti banyere mwakpo ahụ nke chụpụgoro ọtụtụ narị mmadụ n’ụlọ ha ma kwuo na nke a nwereike ibute agha na mpaghara ahụ.
Otu onye bi na obodo Bukavu na-achọghị ka a kpọọ aha ya maka egwu nchekwa ya, gwara ndi ntaakuko na egwu ekweghị ọtụtụ mmadụ pụta n’ụlọ ha.
O kwuru na ọtụtụ ụmụaka na ndị ntorobia eburula egbe ma na-agba mgbọ n’akụkụ dị iche iche ma na-ezu ohi.
Ụbọchị Fraịde abali iri na anonke onwa Febụwarị 2025, ndịagha M23 wakporo ma nwere ọnọdụ n’ọdọụgbọelu ma malite na-abanye obodo ahụ bụ isi obodo mpaghara Saụt Kivu
Leave a Reply