Praịm Minista mba Briten bụ Keir Starmer ekwuola na “ọ dị njikere” itinye ndịagha ha na mba Yukren iji nye aka chekwaa udo na mpaghara ahụ.
O kwuru na inweta udo ga-anọte aka na mba Yukren dị “oke mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ igbochi Putin ime mwakpo ọzọ n’ọdịnihu”.
Tupuu o sonye n’ọgbakọ pụrụiche ndị Yurope ga-eme n’ụbọchị Mọnde, Maazị Keir kwuru na mba Briten dị njikere inye aka na nchekwa mba Yukren site “n’itinye ndịagha anyị na mba ahụ ma ọ dị mkpa.”
“Ọ bụghị ihe m ji nwayọọ ekwu,” ka o dere n’akwụkwọ mgbasaozi Daily Telegragh. “Ọ na-emetụ m nke ukwuu n’ihe ọ pụtara itinye ndịagha anyị n’ihu ọrụ.”
Praịm Minista gbakwụnyere: “Mana ọrụ ọbụla ga-enye aka weta nchekwa na Yukren bụ ọrụ inye aka weta nchekwa na mpaghara Yurope, nakwa nchekwa mba anyị.”
Nkwụsị agha Rọshịa na-ebuso Yukren “ọ bịa, ọ gaghị abụ naanị nwa mgbe nta tupu Putin awakpoo ọzọ”, ka Maazị Keir kwuru.
E nwereike iziga ndịagha Briten na ndị ogbo ha si na mba Yurope ndị ọzọ nọ n’akụkụ okeala ebe Yukren kpachiri nakwa nke Rọshịa kpachiri.
Praịm Minista dị mbụ rụtụaka na ndịagha Briten nwereike isonye n’ichekwa mba Yukren ma ọ bụrụ akwụsị ịkwa mgbọ.
Ya na Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump nakwado izute na Washington na ngwụcha ọnwa a ma kwuo na nchekwa mba Amerịka ga-eweta ga-enye aka ka e nwee udo maka na ọ bụ naanị Amerịka ga-egbochi Putin ịwakpo Yukren ọzọ.
Ọgbakọ Maazị Keir na ndị ndu Yurope ndị ọzọ bụ na nzaghachị mkparịtaụka udo Amerịka na Rọshịa na-akwado inwe nke ga-emetụta mpaghara Yurope.
Leave a Reply