Ndịagha Izrel ewezugala ahụ na mpaghara Netzarim ogige ndịagha kewara mpaghara Nọt na Saụt Gaza.
Ọtụtụ narị ndị Palestinia malitere iburu ngwongwo ha laghachi mpaghara Nọt Gaza ebe e nwere ọtụtụ mbibi oge gara aga dịka ndịagha ahụ wezugara onwe.
Nwezuga ndịagha ahụ na-abịa dịka e nwere nkwekọrịta ịkwụzị ịkwa mgbọ n’ụbọchị Sọnde abali iri na itolu nke onwa Jenụwarị 2025 nke mere ka atọhapụ mmadụ iri abuo na otu Izrel na ndị Palestenia dị nari ise iri isii na isii a nwụchiri.
A na-ekwu na na ngwụcha agba nke mbụ nkwekọrịta ahụ nke ga-abịa n’ime izuụka atọ na-abịa, a ga-atọhapụ mmadụ iri ato na ato a nwụchiri na mmadụ otu puku na nari itolu a tụrụ mkpọrọ. Mba Izrel kwuru na mmadụ asato n’ime mmadụ iri ato na ato ahụ anwụọla.
Leave a Reply