Take a fresh look at your lifestyle.

Sam Nujoma nke mba Namibia anwụọla

0 186

Onyeisiala nke mbụ na mba Namibia bụ Sam Nujoma anwụọla. Sam Nuhoma nwụrụ mgbe ọ dị afọ iri itoolu na ise.

Sam Nujoma nwụrụ n’isi obodo Windhoek, dị na Namibia.

Sam Nujoma bụ onye ndu otu a na-akpọ Namibia’s liberation movement a makwara n’afọ 1960 dịka South West Peoples’ Organisation (Swapo).

Ọ bụ otu ahụ zọtara ị si na mba Saụt Afrịka kewapụta mba Namibia n’afọ 1990.

Ozi Onyeisiala mba Namibia bụ Bangolo Mbumba zipuru mere ka a mata na Nujoma dara n’ọrịa n’izu ụka atọ garaaga bụ nke e jiri buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọ nwụọ.

Bangolo sị na mgbe mba Namibia zọtara nwere onwe ha n’afọ 1990, Nujoma chiri mba Namibia bido n’afọ 1990 ruo n’afọ 2005 dịka Onyeisiala.

Onyeisiala Mbumba kwuru na “Nujoma bụ onye bunitere mmụọ ha ị bụ ndị amaala mba Namibia”.

N’aka nke ọzọ, Onyeisiala mba Saụt Afrịka bụ Cyril Ramaphosa kọwara Nujoma dịka “onye a maa ama na-azọ nwere onwe pụrụiche” ma bụrụkwa onye so lụọ ọgụ ka ọchịchị ndị ọcha kwụsị na mba Saụt Afrịka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *