Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onyeisiala Shettima Ga-Edu Ndị Nnọchianya Naịjirịa Gaa Cote D’Ivoire

Timothy Choji dere ya na bekee

0 333

Onyeisiala Bola Tinubu, GCFR, enyela osote onyeisiala Kashim Shettima ntụziaka ka o duo otu onyeisiala na asọmpi iko mba Afrịka (AFCON) na Côte d’Ivoire.

Osote Onyeisiala nọchitere anya onyeisiala na ọkara ikpeazụ mgbe Super Eagles meriri South Africa na asọmpi kpụ ọkụ n’ọnụ.

Ndị otu mba Naijiria ga-ezute Côte d’Ivoire onye ọbịa n’asọmpi dị egwu n’ama egwuregwu Alassane Ouattara dị n’Abidjan n’ụbọchị Sọnde, abalị iri na otu nke ọnwa Febụwarị.

Egwuregwu a ga-echetaghachi mmeri Naijiria jiri otu ọkpụ merie n’ọkwa otu, nke Captain William Troost-Ekong nwetara site na penariti.

Ike ịdị n’otu

N’ịghọta ike ịgba bọọlụ n’otu na nnukwu ọrụ Super Eagles na-arụ n’ịkwalite mpako na ịdị n’otu obodo, Onyeisiala Bola Tinubu kwenyere na ọbịbịa osote onyeisiala Shettima nọ na asọmpi ikpeazụ n’akụkụ ndị nnọchiteanya ahụ bụ ihe na-egosi na gọọmentị na-akwado ndị otu egwuregwu ahụ na nraranye ya. ka ha nwee ihe ịga nke ọma.

Ya mere, gọọmentị na-akpọku ụmụ Naijiria niile, ma ndị nọ n’ụlọ ma na mba ofesi, ka ha dịrị n’otu n’ịkwado Super Eagles, na-eweli olu ha na agbamume, na iwepụta oke mpako nke mba na-eme ka otu ahụ nwee otuto.

 

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *