Take a fresh look at your lifestyle.

Ozi Hope Uzodimma nye ndị Imo dịka ana edu ya iyi ọrụ nke ugboro abụọ ya

0 280

Na abali iri na ise nke onwa Jenụwarị, 2024 ka ehiwere Hope Uzodimma n’ọkwa dịka Gọvanọ Imo steeti nke ugboro abụọ ya.

N’ozi o zigaara ndị Imo, o kelere ha maka etu ha siri kwadoo ya ruo ụbọchị taa. O ji ohere ahụ nabata osote gọvanọ ọhụrụ bụ Lady Chinyere Ekomaru.

Cheta na Uzodimma hapụrụ Prof. Placid Njoku bụbu osote gọvanọ ya na ntuliakaelu afọ 2023.

‘’Ndị Imo m ji eme ọnu, ọ bụ obi jupụtara n’aṅụrị ka m ji abanye n’ọkwa nke ugboro abụọ dịka odibo ụnụ ma bụrụkwa onye ndu ụnụ.’’

‘’Obi jupụtara m n’aṅụrị maka etu ụnụ si akwado m, nke mere anyị niile jiri gbakọta aka i ji mee ka Imo steeti dị mma,’’ ka o kwuru.

Hope Uzodimma ji ohere ahụ wee nabata osote gọvanọ ọhụrụ bụ Lady Chinyere Ekomaru.

N’okwu ya, ‘’Mụ na osote gọvanọ ọhụrụ bụ Lady Chinyere Ekomaru nakwa ndị otu anyị ndị ọzọ ga-agbakọaka ịhụ na okwukwe ụnụ nwere n’anyị ga-abụ ihe mịtara mkpụrụ ọma’’

”Emume nranye ọchịchị ọhụru a abụghị nke naani m, kama ọ bụ nke ụmụafọ Imo niile, nke a mere m ji akpọkụ ụnụ niile, ebe ọbụla onye nọ, gbakọtanụ ka anyị ṅụrịa maka njem ọhụrụ anyị a.’’

O kelere ndị ọbịa bịara emụme ahụ ma gwa ha na Imo steeti ga-eleta ha anya nke ọma. N’okwu ya, dịka anyị banyere njem ọhụrụ a, anyị dị njikere ị rụrụ ọrụ na-aga n’ihu n’Imo steeti. Anyị tinyere uche anyị niile n’ọrụ a.’’

Daalụ nụ, ka oke steeti anyị bụ Imo gaa n’ihu na-enweta mmerị site na mbọ anyị niile na-agba.’’

Leave A Reply

Your email address will not be published.