Take a fresh look at your lifestyle.

Dangote Refinery amalitela ọrụ

0 370

Ụlọ na-esika mmanụ agbadị bụ Dangote Oil Refinery amalitela ọrụ n’isi ụtụtụ Fraịde.

Ụlọọrụ ahụ gbara ama a ozi ha zipụtara n’ọbaozi X ụbọchị Satode.

O zi ahụ sịrị,”Nke a bụ nnukwu ụbọchị maka Naijiria. Obi dị anyị ụtọ na anyị ruru n’ọkwa dị ịrịba ama a.”

Ụlọọrụ ahụ kwuru n’ozi ha wepụtara na ụlọ nrụpụta mmanụ ha nwere ike izute pasent 100 ihe Nigeria chọrọ maka ngwaahịa dịka mmanụ ụgbọala, mmanụ dizel, kerosene, na ụgbọelu, ma nwekwa njupụta nke ngwaahịa ndị aga-ebupụ rie na mba ofesi.

Ụlọọrụ nnụcha mmanụ Dangote ahu na mgbe mbụ ka akwadoro imepe ya n’afọ 2021, mana onyeisiala Naijịria na oge ahụ bụ Muhammadu Buhari mepere ya n’afọ 2023.

Kemgbe ọ banyere n’ ọkwa n’ọnwa May, 2023 Onyeisiala Bola Tinubu akwụsịla enyemaka mmanụ ọkụ, hazịgharịa ego naira na mgbanwe akụnaụba, na-ekwu na ọ ga-adọta ego na mba ọzọ ma wulite ọganihu Naịjịrịa ogologo oge n’adịghị anya.

Ka ụlọọrụ nnọcha mmanụ nke Dangote na-amalite ọrụ, a na-atụkwa anya na ụlọọrụ nke dị na Port Harcourt ga-amalite ọrụ mgbe na-adịghị anya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.