Akụkọ na-eru anyị ntụ ugbua na-ekwu na a hụla okporo ‘Titanic Submersible’ a na-achọ achọ kemgbe ụbọchịụka.
Ụgbọmmiri a kpọrọ ‘Titanic Submersible’ zọpụrụ ije n’ikperemmiri Newfoundland dị na mba Kanada gawa ebe ụgbọmmiri ‘Titanic’ kụsara ọtụtụ afọ gara aga.
Ndị ọrụ gbatagbata kwuru na ha ahụla mpekere akụkụ ụgbọmmiri ahụ ise na nso n’ebe Titanic nke ochie kpọkasịburu.
Ha sịrị na ụgbọmmiri ahụ ‘gbara’ nke butere ọdachi ahụ.
Rear Admiral Mauger nke US Coast Guard, onye gbaara ndị ntaakụkọ ama a n’abalị Tọzde kwuru na ọ ga-esi ike nweta ozu mmadụ ise nọ n’ime ụgbọmmiri ‘Titan Submersible’.
Rear Admiral Mauger gara n’ihu kwuo na ụgbọmmiri itoolu ka nọ n’ebe a hụrụ okpokoro ụgbọmmiri ahụ kpọkasịrị.
Ọ sịkwara, “Anyị nwere ndị ọrụ ahụike, ndị tekụnụzụ.” Anyị ga-amalite ikposa ndị ọrụ n’awa iri abụọ na anọ na-abịa.”
“Ebe a bụ ebe dị oke egwu, ịrụ ọrụ ebe a siri ike.”
Ọ gara n’ihu tie ezinaụlọ ndị ọ metụtara aka n’obi, sị ha kara obi nabata na mmadụ ise ahụ achịsala ọwa.
Leave a Reply